igbo catholic community (icc) of new york, at angela ... · chineke onye amara na onye ebere! onye...

4
IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW YORK. SUNDAY BULLETIN: HOLY TRINITY SUNDAY (YEAR A) SUNDAY, JUNE 07, 2020 HYMNS: ENTRANCE: LEE M DINWENU, ABIARA M... OFFERTORY: OGOZIE GI/ONYINYE DI MMA CONSECRATION: TAKE AND SANCTIFY COMMUNION: NARANUM RIE (UMU CHINEKE) POST COMMUNION:AGUU GI….. DISMISSAL: ATO N’OTU CHINEKE DI NGOZI

Upload: others

Post on 06-Feb-2021

3 views

Category:

Documents


0 download

TRANSCRIPT

  • IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF

    NEW YORK,

    AT ANGELA MERICI PARISH,

    BRONX, NEW YORK.

    SUNDAY BULLETIN: HOLY TRINITY

    SUNDAY (YEAR A)

    SUNDAY, JUNE 07, 2020

    HYMNS:

    ENTRANCE: LEE M DINWENU, ABIARA M...

    OFFERTORY: OGOZIE GI/ONYINYE DI MMA

    CONSECRATION: TAKE AND SANCTIFY

    COMMUNION: NARANUM RIE (UMU CHINEKE)

    POST COMMUNION:AGUU GI…..

    DISMISSAL: ATO N’OTU CHINEKE DI NGOZI

  • EKPERE MMEGHE

    Chineke Nna, I ziteere uwa Okwu nke Eziokwu na Mmuo nke ido nso, were mee ka ihe omimi Gi di

    itunanya chawaputa n’ihu mmadu. Biko, mee ka anyi bu ndi na-ekwuputa ezi okwukwe mata ebube

    nke Atonotu di ngozi di ebighi ebi; ka anyi were sekpuoro idiko n’otu di n’ike ebube Eze Gi. Site na

    Dinwenu anyi….

    IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Akwukwo Opupu 34:4-6; 8-9

    Isi Okwu: Onyenweanyi, Onyenweanyi, Chineke Onye amara na Onye ebere!

    N’uzo ututu, Mosis buuru mbadamba nkume abuo rigoro n’ugwu Sainai dika Onyenweanyi nyere

    n’iwu. Mgbe Onyenweanyi ridatara n’udi urukpu, O soro Mosis guzoro wee kwuputa na aha Ya bu

    “Onyenweanyi”. Onyenweanyi wee si otu a gafee ya n’ihu tie mkpu si: Onyenweanyi, Onyenweanyi,

    Chineke Onye amara na Onye ebere! Onye na-anaghi ewe iwe oku ma O bara uba n’obi oma na idebe

    nkwa O kwere” Mosis wee gbuoro Ya isi ala na ikpere ala. O wee si: “Onyenweanyi”, o buru na ihe m

    na-amasi Gi, bia ka anyi na Gi soro. N’ezie, ha bu ndi isi ike, na ndi na-adighi ekwe ekwe. Ma gbaghara

    ajo omume na mmehie anyi. Nabata anyi ka ndi nke Gi”

    Okwu nke Oseburuwa.

    Ekele diri Chukwu.

    ABUOMA NA AZIZA YA

    Aziza: Otito na ebube diri Gi ebighi ebi.

    1. Onyenweanyi Chineke nna nna anyi ha, ngozi diri Gi. Otito na ebube diri Gi ebighi ebi. Ngozi

    diri aha nso Gi di ebube. Ebube na otito kacha elu diri Gi mgbe nile. Aziza

    2. Ngozi diri Gi n’ulo nso nke ebube nso Gi. Otito na ebube kacha elu diri Gi ebighi ebi. Aziza

    3. Ngozi diri Gi n’oche eze nke alaeze Gi. Otito na ebube kacha elu diri Gi ebighi ebi. Aziza

    4. Ngozi diri Gi bu Onye na-esi n’oche Eze Gi nke di n’elu ndi Mmioma wee na-enyonye anya

    n’omimi nke uwa. Otito na ebube kacha elu diri Gi ebighi ebi. Aziza

    5. Ngozi diri Gi na mbara igwe. Otito na ebube diri Gi ebighi ebi. Aziza

    IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Ozi nke Abuo Pol di aso degaara ndi Korint 13:11-13

    Isi Okwu: Ka ngozi nke Onyenweanyi, Jesu Kristi, na ihunanya nke Chineke, na idiko n’otu nke Mmuo

    Nso

    Umunna m! Na nkwubi-okwu m, nodunu mma! Gbaanu mbo ka unu zuo oke n’ihe nile! Tinyenu aririo

    na ndumodu m n’obi! Werenu otu obi na-eme ihe. Na-ebinu n’udo! Chineke nke ihunanya na nke udo

    ga-anonyekwara unu. Na-enyeritanu ibe unu ekele nke udo ahu, e jiri mara nwanne na nwanne! Ndi

    nso, ndi mu na ha no, na-ekelekwa unu. Ka ngozi nke Onyenweanyi, Jesu Kristi, na ihunanya nke

    Chineke, na idiko n’otu nke Mmuo Nso na-enye diri unu nile

  • Okwu nke Oseburuwa.

    Ekele diri Chukwu.

    ALELUYA

    Aleluya, aleluya! Otito diri Nna na Nwa na Mmuo Nso! Chineke ahu di adi, Onye di ugbu a, na Onye

    na-abianu. Aleluya!!!

    OZIOMA di aso nke John dere 3: 16-18

    Isi Okwu: Chineke zitere Nwa Ya ka uwa site na Ya nweta nzoputa

    Jesu gwara Nikodemos si: Chineke huru uwa n’anya nke na O nyere so Otu Nwa Ya, ka onye o bula nke

    kwere na Ya ghara ila n’iyii, kama ka o nwee ndu ebighi ebi. N’ihi na Chineke eziteghi Nwa Ya n’uwa ka

    O ma uwa ikpe, kama ka O zoputa uwa. A gaghi ama onye kwere na Ya ikpe, ma a maalari onye na-

    ekweghi na Ya ikpe, n’ihi na o kweghi na Nwa ahu Chineke muru nani Ya.

    Ozioma nke Oseburuwa.

    Otito diri Gi, Kristi.

  • SOLEMNITY OF THE MOST HOLY TRINITY

    This feast is one of the foundational doctrines of our Catholic faith that teaches about the existence of

    One God with Three Distinct Persons. It teaches us of the creative, saving and sanctifying actions of

    God as three distinct persons. The Father is described as God in Philippians (1:2), Jesus as God in Titus

    (2:13) and Holy Spirit as God also in Acts (5:3-4) God the Father sent the Son into the world (Jn 3:16)

    and in the same manner the Holy Spirit was sent into the world (Jn. 14:26, Acts 2:) God is equal,

    indivisible and immutable. The Oneness and Unity of the three persons in one God challenges us to

    work for unity of purpose in life. We only talk about the distinction by virtue of functions or

    operations as person, God the Father created, God the Son redeemed and God the Holy Spirit

    sanctifies. Thus, we say, ''the grace of the Lord Jesus Christ, the love of God and the fellowship of the

    Holy Spirit.." (2Cor 13: 13) We express our belief when we say: Credo in unum Deum, Patrem

    Omnipotentem, factorem caeli et terrae, visibilium omni et invisibilium...

    Happy Trinity Sunday!!!

    Produced by ICC Choir